Ntụcha ụbụbọ nke okwu ọnụ Jega na ntụli aka elu izugbe Naịjirịa n’afọ 2015

Authors

  • Aboh, S. C. Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ,
  • Ahamefula, N. O. Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ,

Keywords:

Atụmatụ okwu emereme, Ụkpụrụ mmekọrịta, Nnyocha Ụbụbọ Kempụrụiche, Okwuntụli aka elu, Ụbụbọ ndọrọ-ndọrọ ọchịchị, Jega, INEC, Cooperative Principles, Critical Discourse Analysis

Abstract

Igbo

Ntụli aka elu bụ otu n’ime usoro ọchịchị onye kwuo uche ya nke e ji enweta ọchịchị ọhụrụ. N’ímē ntụli aka elu na Naịjirịa, otu na-ahazi ntụli aka elu nke ndị oyibo kpọrọ Electoral Management Board (EMB) bụ otu ntụli aka elu izugbe nnọrọonwe, INEC. Na ntụli aka elu izugbe e mere na Naịjirịa n’afọ 2015, onye isi otu ndị na-ahazi ntụli aka elu, ọka nkuzi Attahiru Jega kwuru ụfọdụ okwu. Site n’iji nchọcha nkọwa sọvei (descriptive survey), nchọcha a na-atụcha okwu ọnụ Jega n’oge a na-eme ntụli aka elu izugbe n’afọ 2015 iji wee chọpụta usoro ndokọ okwu ọnụ ya na mpụtara ha. Nchọcha ji atụmatụ ukpụrụ mmekọrịta Grice na ntụcha ụbụbọ kempụrụiche (Critical Discourse Analysis) wee rụọ ọrụ. Site na nchọcha a, a chọpụtara na ndokọ okwu ọnụ abụọ e ji rụọ ọrụ nwere ngalaba anọ ndị gunyere: ngalaba A (ekele na mkpọlite); ngalaba B (okwu a kpụ n’ọnụ); ngalaba CH (ihe ndị na-eche aka mgba na ihe emerela gbasara ha), na ngalaba D (iji ozi olile anya na okwukwe were mechie). A chọpụtara na a bịa na ngalaba A, Jega mezuru iwu okwukwu ezi okwu n’okwu A mana ọ dara iwu okwukwu ezi okwu n’okwu B nke mere ka ọ dachaa na mkparịta ụka. Ọzọ, nchọcha chọpụtara na ngalaba a emezughi iwu ndomanya n’ihi na ọ dịghị nkenke. A kọwapụtara mpụtara okwu ọnụ Jega ebe a nọrọ hụ na ha dị mma.

English

Election is one of the democratic processes of ushering in a new government. In the conduct of election in Nigeria, the Electoral Management Body (EMB) responsible is the Independent National Electoral Commission headed by a chairman. In the last Nigeria’s general elections in 2015, the INEC chairman, Professor Attahiru Jega made some speeches. By adopting the descriptive survey research design, this paper analyses the speeches of Jega during the 2015 general elections in order to discover the structural patterns of the speeches and their outcomes. The paper adopts the Grice’s cooperative principle and critical discourse analysis as its frameworks. From the study, the paper discovers that the structuring of the two speeches under study has four sections which include: section A (greetings and introduction), section B (situations at hand), section C (problems encountered and the solutions put in place), and section D (conclusion with messages of hope and faith). It was observed that in section A that Jega fulfilled the maxim of quality in speech A but flouted this maxim in speech B thereby committing a conversational implicature. Also, the research finds out that this section fails to fulfil the maxim of manner because it fails to be brief. The paper also discovers that the outcomes of the speeches and discovers that the outcomes are positively based than negatively based.

Author Biographies

Aboh, S. C., Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ,

Mahadum Naịjirịa, Nsụka

 

Ahamefula, N. O., Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ,

Mahadum Naịjirịa, Nsụka

 

Downloads

Published

2018-12-01

How to Cite

S. C., A. ., & N. O., A. . (2018). Ntụcha ụbụbọ nke okwu ọnụ Jega na ntụli aka elu izugbe Naịjirịa n’afọ 2015. Journal of The Linguistic Association of Nigeria, 21(3), 52–65. Retrieved from https://jolan.com.ng/index.php/home/article/view/141