Nnyocha ekwumekwu mgbanwe ndị All Progressive Congress (APC) site n’ịgbado ụkwụ n’atụmatụ nnyocha ụbụbo kempụrụiche

Authors

  • Ahamefula, N.O. Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ,
  • Aboh, S.C. Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ,

Keywords:

ntụli aka elu, akụnụba Naịjirịa, okwu mgbanwe, APC, NỤK

Abstract

Ntụli aka elu e mere na Naịjirịa n’afọ 2015 webatara APC n’ọchịchị. Tupu e mee ntụli aka elu ahụ, otu ndọrọ-ndorọ ọchịchị APC, mgbe ha na-achụ nta vootu kwere nkwa iwete mgbanwe n’ihe niile. Ihe na-edochaghị anya bụ ma okwu mgbanwe a ọ bụ n’ụdị nke ọma ya ka ọ bụ njọ. O ruola ihe dị ka ọnwa iri na anọ kemgbe APC banyere n’ọchịchị, ajụjụ bụ ịmata n’ogo ole APC mezuru nkwa mgbanwe. Oke nchọcha a bụ n’akụkụ akụnụba Naịjịrịa iji mata etu mgbanwe a si apụta ihe. Site n’ihe na-eme n’obodo, ilebanye anya n’ekwumekwu mgbanwe a dị mkpa. E ji atụmatụ nnyocha ụbụbọ kempụrụiche (NỤK) wee rụọ ọrụ na nchọcha a. Nchọcha a lebanyere anya n’ọfọdụ okwu Buhari kwuru mgbe ọ naachụ nta vootu ebe ọ nọ wee kwuputa mperi ọchịchị PDP riri nke ọ gbadoro ụkwụ na ha na-ekwu na Naịjirịa chọrọ mgbanwe. Nchọcha a chọpụtara na mgbanwe e kwere ndị Naịjirịa na nkwa na-apụta ihe n’ụzọ dị njọ karịa n’ụzọ dị mma. A chọpụtara na ọnọdụ akụnụba adịghị etu ọ dị na mbụ. Mmezu nkwa nke ime ka otu dọla bụrụ otu naịra anaghị apụta ihe. Ọnụ ego ngwa ahịa na ihe a na-eri eri nọ n’elu ọjị. Nchọcha chịkọtara na mgbanwe na-apụta ihe n’ụzọ dị njọ nke na e kwesiri ime ihe ga-akwalite ọnọdụ akụnụba Naịjirịa.

Author Biographies

Ahamefula, N.O., Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ,

Mahadum Naịjirịa, Nsụka

 

Aboh, S.C., Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ,

Mahadum Naịjirịa, Nsụka

References

Abiodun (2015). ‘Prospects for democratic consolidation in Africa: Nigeria’s transition.’ Retrievable from www.vanguardngr.com/2015/02/chatham-house-buharis-speech-onnigerias-transition/

Agbakwuru, J. (2015). ‘Nigerians yet to feel Buhari’s change mantra’. Retrieved from http://www.vanguard.com on 20/02/2016.

Agbedo, C. U. (2015). General linguistics: Historical and comparative perspectives. Nsukka: KUMCEE Ltd.

Agomuo, Z. (February 11, 2013). Possible risks in opposition merger ahead 2015. Business Daily.

Retrieved from businessdaily.com on 15/02/2016.

Cuttings, J. (2002). Pragmatics and discourse. London: Rotuledge. Dailypost (2014). Full text of Buhari’s speech at his formal declaration at his formal declaration for presidency. [www.dailypost.ng/2014/10/15/full-text-buharis-speech-formaldeclaration-presidency/].

Eminue, O. (2001). Introduction to political science (2nd Ed.). Calabar: Cats Publishers.

Fairclough, N. L. and Wodak, R. (1997). ‘Critical discourse analysis’ In T. A. Van Dijk (Ed.) Discourse Studies. A Multidisciplinary Introduction (pp. 258-284). London: Sage.

Fairclough, N. (1992). Discourse and social change. Cambridge. Polity Print.

Idiagbon, M.S. (2010). ‘Language use in selected Nigerian presidential election campaign speeches: A Critical Discourse Analysis perspective’. Journal of the Nigeria English Studies Association (JNESA), 13(2), 30-44.

Information blog (2015). A continuous assessment of Buhari's administration. Retrieved from

http://www.informantblog.com/2015/09/continous-interim-assessment-of-nigeria--president-muhammadu-buhari.html on 27/08/2016.

Kwaghga, B. (2012). Good governance and credible elections in Nigeria’. Journal of Social Science and Public Policy, 4, 65-72.

Nwabughiogu, L. (2016). Economy: Criticism against Buhari’s government, unfair- Presidency. Retrieved from http://www.vanguardngr.com/2016/08/economy-buhari-committedinventing-new-prosperous-nigeria-presidency/ on 25/08/2016.

Ojomoyela, R. (2015). ‘Olujimi decides APC’s change mantra’. Retrieved from www.vanguard.com/2015/12/olujimi-decides-apcs-change-mantra on 18/02/2016. The merger this time! (February 13, 2013). PmNews. Retrieved from www.pmnews.com on 14/02/2016.

van Dijk, T. (2010). Discourse and power. Journal of sociolinguistics, 014(2), 283-294.

Downloads

Published

2018-03-01

How to Cite

N.O., A. ., & S.C., A. . (2018). Nnyocha ekwumekwu mgbanwe ndị All Progressive Congress (APC) site n’ịgbado ụkwụ n’atụmatụ nnyocha ụbụbo kempụrụiche. Journal of The Linguistic Association of Nigeria, 21(1), 23–28. Retrieved from https://jolan.com.ng/index.php/home/article/view/134